Galatians 2:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Okwu banyere obibi ugwu agaraghị adapụta, ma ọ bụghị na e nwere ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ndị na-abụkwaghị ndị Kraịst nꞌezie, ndị batara nꞌọgbakọ ahụ na nzuzo. Ndị a batara inyocha ụdị inwe onwe anyị nke anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs, na ịchọpụta ma anyị na-erubekwa isi nꞌiwu ndị Juu. Ndị a gbalịrị iji iwu ndị Juu kee anyị agbụ ime anyị ka anyị bụrụ ndị ohu nke iwu ahụ.
Igbo 2006
ma n'ihi umu-nna ugha ndi ekubatarari na nzuzo, madu ndi b͕ebatara ka ha ledo inwe-onwe-ayi nke ayi nwere nime Kraist Jisus, ka ha we me ka ayi buru orù:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.