Galatians 2:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị isi chọọchị nile nọ nꞌebe ahụ, atụkwasịghị ihe ọ bụla nꞌozi ọma m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ma ihe banyere ọnọdụ ha dị ka ndị ozi emetụghị m nꞌobi, nꞌihi na anyị nile bụ otu nꞌihu Chineke.
Igbo 2006
Ma site n'ọnu ndi akpọrọ ihe (aha madu ha buri n'oge gara aga, o meghi ihe di iche n'anyam: Chineke adighi-ele madu anya n'iru) asim, na ndi ahu akpọrọ ihe enyeghm ìzù ọ bula:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.