Galatians 2:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Kama, mgbe Pita, Jemes na Jọn, ndị bụ ndị isi chọọchị hụrụ otu Chineke si jiri m rụọ ọrụ, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, dị ka Chineke nꞌonwe ya si gọzie Pita, nꞌọrụ ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nꞌihi na ọ bụ otu Chineke ahụ nyere Pita onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nyekwa m onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ndị isi ahụ nile nara mu na Banabas aka, gbaa anyị ume, sị anyị gaa nꞌihu nꞌọrụ anyị, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nꞌihu ịrụ ọrụ nke ha nꞌetiti ndị Juu.
Igbo 2006
kama n'akuku ọzọ, mb͕e ha huru na enyereri ozi ọma nke ndi ebìghi-úgwù n'akam na ntukwasi-obi idebe, dika enyereri Pita ozi ọma nke ndi obibi-úgwù n'aka idebe
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.