Galatians 3:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galetia! Ònye bụ dibia ahụ tara ose gbụọ unu nꞌanya, ime ka unu gharakwa ịghọta ihe ọnwụ Kraịst pụtara, dị ka unu si ghọta ya mgbe m kọwaara unu ya na mbụ?
Igbo 2006
Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n'anya-unu, dika Onye akpọgidereri n'obe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst.