Galatians 3:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọ bụla Chineke ga-agụ nꞌonye ezi omume nꞌihi na o debere iwu. Akwụkwọ nsọ agwala anyị na ọ bụ nanị site nꞌịtụkwasị Chineke obi ka mmadụ ọ bụla pụrụ inwe ndụ.
Igbo 2006
Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n'onye ezi omume n'iwu n'iru Chineke: n'ihi na, Onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”