Galatians 3:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Kraịst agbapụtala anyị site nꞌọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. O bokwasịrị onwe ya ịbụ ọnụ gaara abụ nke anyị nꞌihi mmehie anyị. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a na-akwụba nꞌelu osisi.”
Igbo 2006
Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.”