Galatians 3:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu maara ụmụnna m na mgbe mmadụ kwere mmadụ ibe ya nkwa, nkwa ahụ na-adịgide ma ọ bụrụ na e dee ya nꞌakwụkwọ, ma ọ bụrụkwa na onye kwere nkwa edekwasị aha ya nꞌakwụkwọ ahụ. Onye kwere ụdị nkwa a agaghị emesịa gbanwee uche ya kpebie ime ihe ọzọ dị iche.
Igbo 2006
Umu-nnam, anamekwu dika madu: Asi na ọ bu nání ọb͕ub͕a-ndu madu, mb͕e edozisiri ya nke-ọma, ọ dighi onye ọ bula nēwezuga ya, ma-ọbu nētiye ihe ọzọ nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a.