Galatians 3:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu a kwa, Chineke kwere Eberaham na nwa ya nkwa. Ma nkwa a Chineke kwere dịịrị nanị otu nwa Eberaham, onye bụ Kraịst. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na nkwa ahụ adịrịghị ụmụ Eberaham nile.
Igbo 2006
Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst.