Galatians 3:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Gịnị mere Chineke ji nye mmadụ iwu? Chineke nyere iwu ndị a igosi na mmehie dị, na mmehie bara ụba. Ma e mere ka iwu ndị a dịgide nanị tutuu ruo mgbe Mkpụrụ ahụ bịara, onye bụ nwa Eberaham ahụ nkwa Chineke dịịrị. Mgbe Chineke nyere iwu ya o sitere nꞌaka mmụọ ozi ya nye iwu ahụ. Ọ bụkwa mmadụ natara iwu ahụ nyeruo ya ụmụ Izirel.
Igbo 2006
Gini kwa bu iwu ahu? Atukwasiri ya n'ihi njehie, rue mb͕e Nkpuru ahu gābia, bú Onye ekweworo nkwa; esitekwara n'aka ndi-mọ-ozi nye iwu ahu site n'aka onye-ob͕ub͕o.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire.