Galatians 3:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Zaanụ m otu ajụjụ a m chọrọ ịjụ unu. Olee otu unu si nata Mmụọ Nsọ? Ọ̀ bụ site nꞌidebe ihe iwu kwuru, ka ọ bụ site nꞌozi ọma unu nụrụ, na nkwere unu kweere?
Igbo 2006
Náni nka ka m'nāchọ imata n'ọnu-unu, Ùnu sitere n'ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n'ọnunu nke okwukwe nata Ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?