Galatians 3:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nke a ọ̀ na-egosi na iwu Chineke na nkwa ya na-emegide onwe ha? Mba! Chineke ekwela! Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa Chineke inye anyị ụzọ ọzọ a pụrụ isi gbapụta anyị site nꞌagbụ mmehie.
Igbo 2006
Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu.