Galatians 3:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka m jụọkwa unu ajụjụ ọzọ, Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, na ọrụ ebube ọ rụrụ nꞌetiti unu, ò mere ha nꞌihi iwu unu debere? Ka ọ bụ nꞌihi na unu nụrụ ma kwerekwa ozi ọma ahụ?
Igbo 2006
Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?