Galatians 3:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Akwụkwọ nsọ lere anya oge ahụ dị nꞌihu, nke bụ ugbu a, mgbe Chineke ga-azọpụta ndị mba ọzọ, site nꞌokwukwe ha nwere nꞌime ya. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham okwu nꞌoge gara aga sị ya, “Aga m agọzi ndị nile tụkwasịrị m obi na mba dị iche iche, dị ka i si tụkwasị m obi.” Ya mere ndị nile tụkwasịrị Kraịst obi, bụkwa ndị na-eso Eberaham eketa ngọzi ahụ Chineke gọziri ya.
Igbo 2006
Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”