Galatians 4:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Achọrọ m ka unu cheta na ọ bụrụ na nna nwe ụlọ anwụọ hapụrụ nwa ya dị ntakịrị akụ ya nile, o nweghị ihe dị iche nꞌetiti nwa ahụ na ohu nọ nꞌụlọ ahụ, nꞌihi na nwantakịrị ahụ enweghị ike ilezi akụ ahụ anya. Ọ bụ ezie na akụ ahụ nile bụ nke ya, ma o nweghị ihe ọ pụrụ iji ya mee, tutuu o too, bụrụ dimkpa.
Igbo 2006
Ma asim na ka oge ra onye-nketa ahu nọ ka nwa ọhu, ọ dighi iche n'ihe ọ bula n'ebe orù nọ, ọ bu ezie na ọ bu onye-nwe ihe nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Isiokwu m bụ nke a, mgbe nwa bụ onye ga-eketa ihe nna ya ka dị na nwata, ọnọdụ ya akaghị mma karịa nke ohu, ọ bụ ezie na akụ ahụ niile bụ nke ya.