Galatians 4:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, na-agbasonụ ụzọ m, bụrụnụ ndị nwe onwe ha dị ka m si bụrụ onye nwe onwe m, site nꞌiwu. O nweghị ihe ọjọọ ọ bụla unu mere m.
Igbo 2006
Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m.