Galatians 4:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụ ezie na m nọ nꞌọrịa nꞌoge ahụ, unu eledaghị m anya, ma ọ bụ jụ ige m ntị, nꞌihi ahụ ọjọọ m nke gaara abụrụ unu ihe ọnwụnwa iji jụ m. Kama unu nabatara m, dị ka a ga-asị na m bụ mmụọ ozi Chineke zitere, ma ọ bụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya.
Igbo 2006
unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie, ọnọdụ m nʼoge ahụ bụ ọnwụnwa nʼebe unu nọ, unu eledaghị m anya, maọbụ jụ ige m ntị. Kama unu nabatara m, dị ka mmụọ ozi Chineke, maọbụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya.