Galatians 4:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Èbee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere dị, nke anyị nile ji nọkọọ nꞌoge ahụ? Nꞌihi na unu maara nꞌoge ahụ, na a sị na ọ bụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu, tinye ya nꞌọnọdụ anya nke m, iji nyere m aka.
Igbo 2006
Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere nọ? Nʼihi na m na-agba ama, na-asị na ọ bụrụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu nye m.