Galatians 4:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ozizi ụgha ahụ ihe banyere unu na-anụ ọkụ nꞌobi achọghị ịdọtara unu onwe ha nꞌihi ọdịmma unu. Kama ihe ha na-achọ ime bụ ka nkewa dị nꞌetiti mụ na unu, ka unu si otu a hapụ ige m ntị.
Igbo 2006
Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-ezipụta mmasị nʼebe unu nọ, ma ọ bụghị maka ọdịmma unu. Ha chọrọ ikewapụ unu nʼebe m nọ, ka unu nwee mmasị nʼebe ha nọ.