Galatians 4:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A mụrụ nwa ahụ ohu nwanyị ahụ mụrụ dị ka e si amụ ụmụaka ndị ọzọ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ nke a mụrụ nanị mgbe Chineke kwere Eberaham nkwa na-aga amụ ya.
Igbo 2006
Ma ọ bu n'uzọ anu-aru ka amuworo nwa nke sitere n'orù-nwanyi ahu; ma esitewo na nkwa mu nwa nke sitere na nwanyi ahu nwere onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa.