Galatians 4:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a, akụkọ otu e si mụọ ụmụ abụọ a bụ ihe na-egosi anyị ụzọ abụọ pụtara ìhè Chineke si enyere mmadụ aka. Otu ụzọ bụ ụzọ inye ha iwu ya ka ha debe. O nyere ha iwu a nꞌugwu Sainai mgbe o nyere Mosisi iwu iri ahụ. Aha ọzọ ndị Araab na-akpọ ugwu Sainai bụ Ugwu Hega. Hega bụ ohu nwanyị ahụ Eberaham lụrụ. Ọ nọchiri anya obodo Jerusalem nke bụ obodo ndị Juu, ebe isi oche okpukpe ime ihe na-atọ Chineke ụtọ site nꞌidebe iwu dị. Ndị Juu ahụ na-agbalịkwa iso ụzọ a bụ ụmụ Hega, bụrụkwa ndị ohu dị ka ya.
Igbo 2006
Ma ewere ihe ndia ma atù: n'ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n'ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n'orù, nwanyi ahu bu Hega.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega.