Galatians 4:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ nke a mere Aịzaya jiri buo amụma sị, “Ṅụrịa ọṅụ ugbu a, gị nwanyị ahụ na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ gị onye na-enweghị ike mụta nwa ọ bụla. Nꞌihi na aga m enye gị ọtụtụ ụmụ, ụmụ gị ga-akarị ụmụ nke nwanyị ohu ahụ nwere.”
Igbo 2006
N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa; Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme: N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na e dere ya, “Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga, onye na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike gị onye ime nwa na-emetụbeghị, nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.”