Galatians 4:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ugbu a unu amatala Chineke, ka m ga-asị na ọ bụ Chineke chọpụtara unu. Ùnu si aṅaa na-achọkwa ịlaghachi azụ ịghọ ndị ohu nye okpukpe na-enweghị isi, okpukpe nke ike afụ na-adịghị nꞌime ya, okpukpe nke ịchọ ịbụ ndị a na-azọpụta site nꞌidebe iwu?
Igbo 2006
ma ub͕u a, mb͕e unu maworo Chineke, ma-ọbu, nke bu ezi-okwu kari, unu bu ndi Chineke maworo, ùnu si aṅa chighari ọzọ n'ihe-ozizí mbu nādighi ike nēnweghi kwa ihe ọ bula, nke unu nācho ibu orù-ha ọzọ ọhu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa?