Galatians 5:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị, ndị Kraịst mere ka anyị keta oke na ndụ ebighị ebi, adịghị echegbu onwe anyị ma anyị bụ ndị e biri ugwu ma anyị abụghị. Anyị adịkwaghị echegbu onwe anyị ma anyị na-edebe iwu na omenala ndị Juu, ma anyị adịghị edebe ha. Ihe dị anyị mkpa bụ okwukwe nke si nꞌịhụnanya na-egosi onwe ya.
Igbo 2006
N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.