Galatians 6:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?
Igbo 2006
Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.