Galatians 6:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ozizi ahụ na-abịakwute unu, na-agbalị iduhie unu ka e bie unu ugwu, na-eme ya nꞌihi otu ihe. Ha chọrọ ka ndị mmadụ mara ha, ka ha si otu a gbanarị mkpagbu a gaara akpagbu ha, ma ọ bụrụ na ha kwusaa sị na ọ bụ obe Kraịst nanị nwere ike ịzọpụta anyị.
Igbo 2006
Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.