Galatians 6:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị ozizi ahụ na-ezi unu na obibi ugwu bara uru, adịghị agbalị idebe iwu ndị Juu ndị ọzọ. Ma ha chọrọ ka e bie unu ugwu, ka ha site na ya na-anya isi, na unu bụ ndị na-eso ụzọ ha.
Igbo 2006
N'ihi na ndi kwere ka ebì ha úgwù, ọbuná ha onwe-ha adighi-edebe iwu; kama ha nācho ka ebì unu úgwù, ka ha we nya isi n'anu-aru unu onwe-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.