Galatians 6:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Chineke ekwela ka m nyaa isi nꞌihe ọ bụla karịakwa nꞌobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌobe ahụ ka ihe nile dị nꞌụwa, nke na-atọ m ụtọ, na nke na-agụ m agụụ, ji bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Ụtọ nke ụwa na-enwetakwa site nꞌaka m, abụrụkwala ihe nwụrụ anwụ.
Igbo 2006
Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.