Galatians 6:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka onye ọ bụla nꞌetiti unu ghọta ma kpebie nꞌobi ya na ihe ọ na-eme ziri ezi. Mgbe ahụ ọ ga-enwe afọ ojuju nꞌime onwe ya na ọrụ ya bụ ezi ọrụ. Ọ gaghị adịkwa mkpa na ọ ga-eji onwe ya tụnyere onye ọzọ.
Igbo 2006
Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.