Galatians 6:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịgbaketa Chineke azụ, ghara ịta ahụhụ dịrị ya, nꞌihi omume ahụ. Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-ewetakwa nꞌubi ya.
Igbo 2006
Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.