Galatians 6:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ anụ ahụ ya, ga-esitekwa nꞌanụ ahụ ahụ webata ọnwụ dị ka ihe ubi, ma onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ Mmụọ Nsọ, ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.
Igbo 2006
N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.