Genesis 14:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze).
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).