Genesis 16:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n'aka-gi; me ya ihe di nma n'anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n'iru-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.