Genesis 17:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n'etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n'ulo, na onye eji ego b͕ata n'aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị.