Genesis 17:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.