Genesis 17:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị.