Genesis 19:33 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n'abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara.