Genesis 20:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka.