Genesis 24:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwoke ahu we ba n'ulo, ọ tọpu ibu camel-ya; ọ nye ya okporo-ọka na nri-anu-ulo inye camel-ya, na miri isa ukwu-ya na ukwu ndikom ndi ya na ha yikọrọ bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, nwoke ahụ gara nʼụlọ, ebe Leban nyere aka butukwaara ya ibu nke ịnyịnya kamel ndị ahụ bu. E wetara nri nye ịnyịnya kamel ndị ahụ, wetara ya mmiri nke ya na ndị ikom so ya ji saa ụkwụ ha.