Genesis 26:29 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”