Genesis 27:29 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.”