Genesis 30:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.”