Genesis 31:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’