Genesis 31:37 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.