Genesis 31:42 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.”