Genesis 32:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.