Genesis 34:22 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n'etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.