Genesis 34:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.