Genesis 38:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”