Genesis 39:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n'ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n'ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n'ulo na n'ọhia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, Onyenwe anyị gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya.