Genesis 40:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na obu-ihe-ọṅuṅu nke eze Ijipt na osi-ite-ya mehiere megide onye-nwe-ha, bú eze Ijipt.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.